LYRIC

Anywhere you go oo, anywhere you goo
If you no see Ịgbọ man, nwanne gị bòchaa
(Ayamma mma)
Bòchapu ósò na ébé ahụ l’élu ele
(Ayamma mma)
Lachapu ósò na ébé ahụ tiri eti
(Ayamma mma)
Obodo sịrị ike ka ndị Ịgbọ ná-abanye
(Ayamma mma)
Ha banye ébé ahụ hà ebulu ike wee pụta
(Ayamma mma)
Ugochukwu nyere anyị nyawa k’anyi ji aga nụ
(Ayamma mma)
Iyooko iyoo oko oko
Ụmụ Ịgbọ nile, ụmụ Ịgbọ nile
Let’s come together n’anyi ncha bụ ofu
Chukwu bụ ike anyị o, chukwu bụ ike anyị o
Chukwu bụ ike anyị o, nyawa k’anyi ji aga
Ka m’naba n’ala Ịgbọ ébé ahụ amulu mụ
I nee m anya n’ukwu na ife mụ yiri bụ Aba
Innoson Group motor kà ọ na-aluzi
Made in Nnewi nyanwa ka m na-achọ nụ
Abakiliki rice nyanwa ka m na-erizi
Akụ lụọ uno amalu nụ ébé o si bido
Makana
Anywhere you go o
Anywhere you go o
If you no see Ịgbọ man
Nwanne gi bòchaa
Chukwu bụ ike anyị o
Chukwu bụ ike anyị o
Chukwu bụ ike anyị o nyawa k’anyi ji aga
Ọ gịnị dị mèrè, na-anyị adị emezi nwanne
Ọ gịnị dị mèrè, asụsụ anyị ji àlà
Ònye Ịgbọ mụta nwa nuu, osubalu ya oyibo
Oyibo amaka maná oburo asụsụ anyị o
Ijelе be anyị ọ ya kà i na-eme е
Biggie nwanne m, Ịgbọ bụ Ịgbọ anyị ekulie
Ụmụ Ịgbọ nile, ụmụ Ịgbọ nile
Let’s come together n’anyi ncha bụ ofu
Chukwu bụ ike anyị o
Chukwu bụ ike anyị o
Chukwu bụ ike anyị o, nyawa k’anyi ji aga
Alili eligbuo mụ ndi be anyị e gburu n’agha a
Akpata oyi na awụ mụ nyawa ka m ji ebezi
They rape our womenu nya kà m ji etizi
They starve our children nya ka’ m ji ebezi
Nnamdi Kalu, nwanne ji s’ike
Emee élú, mee àlà ná uche Chukwu ga-emelili
Ụmụ Ịgbọ nile, ụmụ Ịgbọ nile
Let’s come together n’anyi ncha bụ ofu
Maka ná anywhere you go oo
Anywhere you go oo
If you no see Ịgbọ man nwanne gi bòchaa
Bòchapu ósò na ébé ahụ l’élu ele
Lachapu ósò na ébé ahụ tiri eti
Ụmụ Ịgbọ na-agba mbọ nụ nya k’anyi na-ekwu nụ
Ajọ mmụọ ná Ajọ mmadụ fa na-eme ná nkịtị
Ijele nwanne m Chukwu k’anyi ji aga
Biggie Igbo nwanne Chukwu ka m ji aga
Maka ná Chukwu bụ ịke anyị o
Chukwu bụ ịke anyị o
Chukwu bụ ịke anyị o nyawa k’anyi ji aga
Genevieve nwa na ndị Ịgbọ ji gị aba
Ijele nwanne na ndị Ịgbọ ji gị aga
Ogadagidi be anyi na ndị Ịgbọ ji gị aba
Chimamanda Adichie na ndị Ịgbọ ji gị aba
Bangladesh ka ndị Ịgbọ na-etipado
Obi na South ná ndị Ịgbọ ji gị ekwú
Iyookoko iyookoko m na-akụ kwa
Mix Monster
Iyo m iyo m iyoo koko

Added by

yanson

SHARE

Comments are off this post